Skip to content

Ndị e nyere ikike ịhapụ ibu ọnụ na Ramadan:

التصنيف الشرعي
الفقهالصيامأحكام الصيام

نص الموضوع

Nkebi nke mbụ: Ndị e nyere ikike ịhapụ ibu ọnụ, ma ọ bụrụ iwu na ha ga-akwụghachi ụgwọ ya, ha bụ:

Nke mbụ: Onye na-arịa ọrịa nke a na-atụ anya ọgwụgwọ ya, nke ibu ọnụ na-akpatara nsogbu ma ọ bụ na-esiri ya ike.

Nke abụọ: Onye njem; ma ọ hụrụ ihe isi ike na njem ahụ ma ọ bụ na ọ hụghị ihe isi ike.

Ya na, ihe akaebe maka ha abụọ bụ: okwu Chukwu Onye Dị Elu:

{...Ma onye ọ bụla na-arịa ọrịa ma ọ bụ nọ na njem, ya jiri ọnụọgụgụ ụbọchị ndị ọzọ (kwụọ ya)...}

[Surah Albakara: 163].

Nke atọ: Nwaanyị dị ime ma ọ bụ nke na-enye nwa ara, ma ọ bụrụ na ibu ọnụ na-esiri ha ike, ma ọ bụ na-emerụ ha ma ọ bụ nwa ha ahụ, ebe a na-ewere ha dị ka onye na-arịa ọrịa, ndị a, o kwere omume ka ha mebie ọnụ,

Mana ọ bụ iwu n'ahụ ha abụọ ịkwụghachi ibu ọnụ n'oge ọzọ.

Nke anọ: Nwaanyị na-ahụ nsọ na onye nọ n'ọbara ọmụmụ, ịhapụ ibu ọnụ bụ iwu n'ahụ ha abụọ,

Ibu ọnụ ha abụọ ezighị ezi, ọ dịkwa n'isi ha abụọ ịkwụghachi ya n'ụbọchị ndị ọzọ.

Nke abụọ: Ndị e nyere ikike ịhapụ ibu ọnụ, mana iwu ji ha inye ihe mgbapụta (Kaffarah) n'enweghị ịkwụghachi ya (Qada'), ha bụ:

Nke mbụ: Onye na-arịa ọrịa a na-enweghị olileanya ọgwụgwọ ya.

Nke abụọ: Onye merela agadi nke na-enweghị ike ibu ọnụ.

Ya mere, ndị a anaghị ebu ọnụ, ma ha na-enye onye dara ogbenye nri maka ụbọchị ọbụla n'ime ọnwa Ramadan,

Ma ọ bụrụ na onye okenye eruo n'ọkwa uche ya ịla azụ n'ihi nká, n'ezie a na-ewepụrụ ya ibu ọrụ okpukpe; ya mere ọ na-ahapụ ibu ọnụ, o nweghịkwa ihe ọ bụla dị n'elu ya.