نص الموضوع
Oge iwepụta ya:
Ọ dị mkpa iwepụta Zakat ngwa ngwa mgbe oge o ji bụrụ iwu ruru,
Amachibidokwara iyigharị ya ma e wezụga maka ihe dị mkpa, dị ka ma ọ bụrụ na akụ̀ na ụba ahụ dị n'obodo dị anya site na ya, enweghịkwa onye ọ nwere ike ime onye nnọchi anya ya.
Ebe iwepụta ya:
Ọ kachasị mma iwepụta Zakat n'obodo ebe akụ na ụba ahụ dị,
A pụkwara ibuga ya site n'obodo ebe akụ na ụba ahụ dị gaa n'obodo ọzọ n'ọnọdụ ndị a:
A- Ọ bụrụ na enweghị onye nọ na mkpa Zakat n'obodo.
B- Ọ bụrụ na e nwere onye ikwu nọ na mkpa n'obodo ọzọ.
C- Ọ bụrụ na e nwere uru iwu kwadoro nke chọrọ ka ebufe ya, dịka: ibufe ya na mpaghara ndị Alakụba nke ọdachi ụnwụ nri na iju mmiri dakwasịrị.
Zakat bụ iwu n'akụ na ụba nke nwatakịrị na onye uche ya na-ezughị okè, n'ihi izugbe nke ihe akaebe, ma onye nlekọta akụ na ụba ha ga-ahụ maka iwepụta ya n'aha ha.
Iwu ahapụghịkwa iwepụta Zakat belụsọ n'ebumnobi,
Maka okwu ya (udo na ngọzi Chineke dịrị ya)ﷺ sị:
"«N'ezie, ọrụ niile dabere n'ebumnobi» [47]."
[10] Al-Bukhari dekọtara ya n'ọnụọgụgụ (142), na Muslim n'ọnụọgụgụ (122).