Skip to content

نص الموضوع

a) Nnwere onwe: Ọ bụghị iwu n'ahụ onye ohu; n'ihi na o nweghị akụ na ụba, ihe ọ bụla dị n'aka ya bụ ihe onwunwe nna ya ukwu, ya mere zakat ya dịrị nna ya ukwu.

b) Islam: Ya mere, ọ bụghị iwu n'ahụ onye na-ekweghị ekwe; n'ihi na ọ bụ ofufe iji bịaruo nso na nrubeisi, onye na-ekweghị ekwekwa esoghị na ndị ruru eru maka ofufe na nrubeisi.

C) Inwe Nisab: Ọ bụghị iwu n'ihe na-erughị Nisab, nke bụ oke akụ̀ na ụba a maara ama.

d) Izu okè nke inwe ihe: Ọ bụ ka akụ na ụba bụrụ nke mmadụ nwe n'ụzọ inwe zuru okè, ya mere, ọ dịghị zaka ọ bụla dị n'ime akụ na ụba nke inwe ya akwụsighị ike, dị ka ụgwọ nkwekọrịta nnwere onwe.

E) Ịgafe otu afọ n'elu akụnụba:

Maka hadis Aisha (ka Chineke nwee afọ ojuju n'ebe ọ nọ) nke e welitere sị:

​«Enweghị zakat n'akụ na ụba ọ bụla ruo mgbe otu afọ gafeere ya» [43].

[43] Ibn Majah dekọtara ya n'ọnụọgụgụ (1792), na At-Tirmidhi n'ọnụọgụgụ (63) na (631).