Iwu maka onye na-enweghị ike iji mmiri na Tayammum:
نص الموضوع
Onye ọ bụla na-enweghị mmiri na ájá, ma ọ bụ ruo n'ọnọdụ ebe ọ na-enweghị ike iji mmiri ma ọ bụ ájá emetụ anụ ahụ ya; ọ ga-ekpe ekpere dịka ọnọdụ ya siri dị, n'enweghị ịsa nsọ ma ọ bụ iji ájá asacha onwe ya; n'ihi na Chineke anaghị ebo mkpụrụ obi ọ bụla ibu karịrị ike ya.
Ma ọ bụrụgodị na o mee na ọ nwetara mmiri na aja mgbe nke ahụ gasịrị, ma ọ bụ nwee ike iji ha mee ihe; ọ gaghị emeghachi ekpere o kpere; n'ihi na o meela ihe e nyere ya n'iwu,
N'ihi okwu Onye Dị Elu:
"{...Ya mere, tụọnụ egwu Chineke dị ka unu siri nwee ike...}"
[Surah At-Taghabun: 16]،
Na maka okwu ya (udo na ngọzi Chineke dịrị ya)ﷺ sị:
«Ọ bụrụ na m nye unu iwu ime otu ihe, meenụ site na ya ihe unu nwere ike» [11].
[10] Al-Bukhari dekọtara ya n'ọnụọgụgụ (142), na Muslim n'ọnụọgụgụ (122).
Ihe iburu n'uche (Fa'idah): Ọ bụrụ na o mee tayammum n'ihi janabah, ma emesịa nweta mmiri; ọ ga-asa ahụ ya (mee ghusl).