Skip to content

نص الموضوع

Ndị ozi: bụ ụdị ọtụtụ nke onye ozi; ọ bụ onye n'ime ụmụ mmadụ nke e nyere mkpughe Iwu, ma e nye ya iwu izisa ya,

Onye mbụ n'ime ha bụ Nuh (udo dịrị ya), ma onye ikpeazụ n'ime ha bụ Muhammad (ka udo na ngọzi Chukwu dịrị ya),

Ma ha bụ ndị mmadụ e kere eke,

Ha enweghị ihe ọ bụla n'ime njirimara nke Ịbụ Onye Nwe na Ịbụ Chukwu.

Ịkwere na ndị ozi gụnyere:

  1. Ikwere na ozi ha bụ eziokwu si n'aka Chukwu,

Onye ọ bụla gọnahụrụ ozi nke otu onye n'ime ha, n'ezie ọ gọnahụla ha niile.

  1. Ịkwere na ndị anyị maara aha ha n'ime ha site n'aha ha, dị ka: Muhammad, Ibrahim, Musa, Isa, na Nuhu (udo dịrị ha). Ha bụ ndị nwere mkpebi siri ike n'ime ndị Ozi.

Ma ndị anyị amaghị aha ha n'ime ha; anyị kwere na ha n'ozuzu ya,

Onye Dị Elu Sịrị:

﴿N'ezie, Anyị zitere ndị ozi tupu gị, n'ime ha bụ ndị Anyị kọọrọ gị akụkọ ha, ma n'ime ha bụ ndị Anyị na-akọghịrị gị akụkọ ha...﴾

[Surah Ghafir: 78].

  1. Ikwenye n'ihe ziri ezi sitere n'aka ha, udo dịrị ha, n'ime akụkọ ha.
  2. Ime ihe kwekọrọ n'iwu (Shari'ah) nke onye e zitere anyị n'ime ha, onye bụ onye ikpeazụ n'ime ha, Muhammad (ka udo na ngọzi Chukwu dịrị ya).