Skip to content

نص الموضوع

Ha bụ ụwa ihe e kere eke a na-adịghị ahụ anya,

Chukwu -Onye kachasị elu- kere ha site na ìhè,

Ha bụ ndị na-efe Chukwu di elu ofufe,

Ha enweghị ihe ọ bụla n'ime njirimara nke Ịbụ Onye Nwe (Chukwu) na Ịbụ Chineke,

Ha anaghị enupụrụ Chukwu isi n'ihe O nyere ha n'iwu,

Ha na-emekwa ihe e nyere ha n'iwu,

Ha dị ọtụtụ, ọ dịghị onye nwere ike ịgụta ha ma e wezuga Chukwu dị elu.

Ịkwere na ndị mmụọ ozi gụnyere ihe anọ:

  1. Inwe okwukwe na ịdị adị ha.
  2. Ịkwere na ndị anyị maara aha ha n'ime ha; dị ka: Jibril, na Mikail, na Israfil, na ndị ọzọ.

Ma onye anyị na-amaghị aha ya, anyị kwenyere na ya n'ozuzu ya.

  1. Inwe okwukwe n'ihe anyị matara banyere njirimara ha, nke e kwuru n'ime Akwụkwọ Nsọ na Sunnah;

Dịka ọdịdị Jibril, Onye Amụma ﷺ kọrọ na ọ hụrụ ya n'ọdịdị nke Chukwu di elu kere ya na ya, na o nwekwara nku narị isii, nke kpuchiri mbara igwe.

  1. Ikweta n'ihe anyị maara banyere ọrụ ha; dị ka nsọpụrụ ha na-enye Chukwu, Onye dị elu, na ife Ya ofufe n'abalị na n'ehihie n'enweghị ike ọgwụgwụ ma ọ bụ ịda mba.

Dịka ọmụmaatụ: Jibril: Onye ntụkwasị obi na mkpughe.

Na Israfil: onye e nyere ọrụ ịfụ opi.

Na mmụọ ozi nke ọnwụ: bụ onye e kenyere ọrụ ịwepụ mkpụrụ obi n'oge ọnwụ.

Na Malik: onye nche ọkụ ahụ. Na Ridwan: onye nche Aljanna, na ndị ọzọ.