Skip to content

Ihe «ịgba àmà na ọ dịghị onye kwesịrị ofufe n'ezie ma e wezụga Allah» pụtara:

نص الموضوع

Ọ bụ ohu ikwupụta site na nkwenye siri ike na ọ nweghị onye kwesịrị ofufe n'eziokwu ma e wezụga Chineke (Onye Dị Elu ma Dị Ebube),

Ya mere, ọ na-efe naanị Chukwu, ma na-arara ụdị ofufe niile nye Ya (Onye Nsọ, Onye Dị Elu); site n'arịrịọ, egwu, olileanya, ịtụkwasị obi na ihe ndị ọzọ.

Shahadah adịghị emezu ma e wezụga n'ogidi abụọ:

Nke mbụ: Ịgọnarị ọbụbụ chi na ofufe nke ihe ọ bụla ọzọ na-abụghị Chukwu; site na ndị mmekọ, chi dị iche iche, nakwa arụsị niile.

Nke abụọ: Ikwenye na ịbụ Chukwu na ofufe n'eziokwu dịrị sọ naanị Chukwu, n'enweghị ihe ọ bụla ọzọ na-abụghị Ya,

Onye Dị Elu Sịrị:

﴿N'ezie, Anyị zitere onye ozi n'ime mba ọ bụla, (na-asị): "Feenụ Chukwu ofufe, ma zerekwanụ arụsị..."﴾

[Sọọdụ Annahl: 36].