نص الموضوع
اعلم أن الله عز وجل خَلَقَ الخَلْق ليعبدوه ولا يشركوا به شيئًا، قال تعالى: ﴿وَمَا خَلَقۡتُ ٱلۡجِنَّ وَٱلۡإِنسَ إِلَّا لِيَعۡبُدُونِ 56﴾ [الذاريات: 56]، وهذه العبادة لا يمكن معرفتها إلا بالعلم، كما قال تعالى: ﴿فَٱعۡلَمۡ أَنَّهُۥ لَآ إِلَٰهَ إِلَّا ٱللَّهُ وَٱسۡتَغۡفِرۡ لِذَنۢبِكَ وَلِلۡمُؤۡمِنِينَ وَٱلۡمُؤۡمِنَٰتِۗ وَٱللَّهُ يَعۡلَمُ مُتَقَلَّبَكُمۡ وَمَثۡوَىٰكُمۡ 19﴾ [محمد: 19]، فبدأ بالعلم قبل القول والعمل. فأهم ما على المسلم تعلُّمه هو توحيد الله عز وجل؛ لأنه هو أصل الدين وأساسه، ولا يقوم الدين إلا بالتوحيد، وهذا هو أول واجب على المسلم، وهو آخر واجب. والتوحيد هو الركن الأول من أركان الإسلام التي يجب على كل مسلم معرفتها والعمل بها، وهي خمسة أركان، كما جاء في حديث عبد الله بن عمر رضي الله عنهما قال: سمعت رسول الله ﷺ يقول: «بُنِيَ الإسْلَامُ عَلَى خَمْسٍ: شَهَادَةِ أنْ لَا إلَهَ إلَّا اللَّهُ وأنَّ مُحَمَّدًا رَسُولُ اللَّهِ، وَإقَامِ الصَّلَاةِ، وَإيتَاءِ الزَّكَاةِ، وَحَجِّ البَيْتِ، وصَوْمِ رَمَضَانَ». فيجب على المسلم تعلُّم معنى التوحيد؛ وهو إفراد الله بالعبادة، فلا يُشرِك معه أحدًا في عبادته؛ لا مَلَكٌ مُقرَّبٌ ولا نبيٌ مُرسَلٌ.
Mara na Chukwu, Onye Dị Ebube, kere ihe niile e kere eke ka ha fee Ya ofufe, ma ghara ijikọta Ya na ihe ọ bụla,
Onye Dị Elu Sịrị:
"Ekeghị M ndị jinn na ụmụ mmadụ ma ọ bụghị ka ha fee M ofufe."
[Sọọdụ Adh-Dhariyat: 56]،
Ma ofufe a, a pụghị ịmata ya ma e wezụga site na mmata,
Dịka Chukwu Onye Dị Elu Sịrị:
{Ya mere, mara na n'ezie, ọ dịghị chi ọzọ ma ọ bụghị Chineke, ma rịọọ mgbaghara maka mmehie gị, nakwa maka ndị kwere ekwe nwoke na ndị kwere ekwe nwanyị. Ma Chineke maara ngagharị unu na ebe obibi unu 19}
[Sọọdụ Muhammad: 19]،
Ya mere, o jiri ihe ọmụma malite tupu okwu na ihe omume.
Ya mere, ihe kachasị mkpa onye Alakụba aghaghị ịmụta bụ ịdị n'otu nke Chukwu, Onye pụrụ ime ihe niile na Onye dị ukwuu; n'ihi na ọ bụ isi okpukpe na ntọala ya,
Okpukperechi adịghị eguzosi ike ma e wezụga site n'ịdị n'otu nke Chukwu, nke a bụkwa ọrụ mbụ dịịrị onye Alakụba, ọ bụkwa ọrụ nke ikpeazụ.
Ịdị n'otu nke Chukwu bụ ogidi nke mbụ n'ime ogidi ndị dị n'Islam nke ọ dị mkpa ka onye alakụba ọ bụla mara ha ma jiri ha rụọ ọrụ, ha bụkwa ogidi ise,
Dịka o siri bịa n'akụkọ Abdullah bin Umar (Chineke nwee mmasị n'ebe ha abụọ nọ), o kwuru sị:
Anụrụ m Onye ozi Allah ﷺ sị:
«A rụrụ Islam n'elu ihe ise: ịgba àmà na ọ dịghị chi ọzọ ma e wezụga Chineke, nakwa na Muhammad bụ onye ozi Chineke, na ikpe ekpere, na inye Zakat, na ịga njem Hajj n'ụlọ nsọ, na ibu ọnụ nke Ramadan»[1].
[1] Albukhari dekọtara ya n'ọnụọgụgụ (8).
Ya mere, ọ dị mkpa ka onye Alakụba mụta ihe ịdị n'otu nke Chukwu pụtara; nke a bụ ife naanị Chukwu,
Ya mere, a gaghị eji onye ọ bụla mee onye mmekọ Ya n'ofufe Ya; ma ọ bụ mmụọ ozi nọ nso, ma ọ bụ onye amụma e zitere.
ملاحظات
أخرجه البخاري برقم (8).