نص الموضوع
الأول: الجماع: فمتى جامع بطل صيامه، ولزمه قضاء ذلك اليوم الذي جامع فيه، ويجب عليه مع القضاء الكفارة، وهي: عتق رقبة، فإن لم يجد فعليه أن يصوم شهرين متتابعين، فإن لم يستطيع بأن لم يقدر لعذر شرعي، فعليه أن يطعم ستين مسكينًا، لكل مسكين نصف صاع من الطعام المأكول في البلد. الثاني: إنزال المني: بسبب تقبيل، أو لمس، أو استمناء، أو تكرار نظر، فعليه القضاء فقط بدون كفارة؛ لأن الكفارة تختص بالجماع. أما النائم فإذا احتلم، فأنزل؛ فلا شيء عليه؛ لأن ذلك بدون اختياره، فيغتسل من الجنابة. الثالث: الأكل والشرب متعمدًا: لقوله تعالى: ﴿وَكُلُواْ وَٱشۡرَبُواْ حَتَّىٰ يَتَبَيَّنَ لَكُمُ ٱلۡخَيۡطُ ٱلۡأَبۡيَضُ مِنَ ٱلۡخَيۡطِ ٱلۡأَسۡوَدِ مِنَ ٱلۡفَجۡرِۖ ثُمَّ أَتِمُّواْ ٱلصِّيَامَ إِلَى ٱلَّيۡلِ...﴾ [البقرة: 187]. أما من أكل أو شرب ناسيًا؛ فلا شيء عليه؛ لحديث: «مَن نَسِيَ وَهُوَ صَائِمٌ، فَأَكَلَ أَوْ شَرِبَ، فَلْيُتِمَّ صَوْمَهُ، فَإِنَّمَا أَطْعَمَهُ اللَّهُ وَسَقَاهُ» [1]. الرابع: إخراج القيء عمدًا، أما من غلبه القيء بدون اختياره؛ فلا يؤثر على صيامه، لقوله ﷺ: «مَنْ ذَرَعَهُ الْقَيءُ فَلَيْسَ عَلَيْهِ قَضَاءٌ، وَمَن اسْتَقَاءَ عَمْدًا فَلْيَقْضِ» [2]. الخامس: إخراج الدم من البدن؛ بحجامة، أو فَصْد، أو سحب دم للتبرع به لإسعاف مريض؛ فيفطر بذلك كله. أما إخراج الدم القليل الذي يستخرج للتحليل؛ فهذا لا يؤثر على الصيام، وكذلك خروج الدم بغير اختياره؛ كالرعاف أو جروح أو خلع سن؛ فهذا لا يؤثر على الصيام.
أخرجه البخاري برقم (6669)، ومسلم برقم (2709).
أخرجه أبو داود برقم (2380)، والترمذي برقم (719)، وابن ماجه برقم (676).
Ihe ndị na-emebi Ibu ọnụ:
Nke mbụ: Mmekọ anụ ahụ: ya mere mgbe ọbụla o mere mmekọ anụ ahụ, ebu ọnụ ya emebiela, ọ ghọkwara iwu n'ahụ ya ikwughachi ụbọchị ahụ nke o mere mmekọ anụ ahụ na ya,
Ọ bụ iwu n'ahụ ya, tinyere ịkwụghachi ya (Qadaa), ịkwụ ụgwọ mmehie (Kaffarah), nke bụ: ịtọhapụ ohu,
Ma ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, ọ bụ iwu n'ahụ ya ibu ọnụ ọnwa abụọ na-esochi ibe ha,
Ọ bụrụ na ọ nweghị ike, n'ihi enweghị ike maka ihe ngọpụ nke iwu kwadoro, ọ dịịrị ya inye ndị ogbenye iri isii nri, onye ogbenye ọ bụla ga-enweta ọkara Sa' n'ime nri a na-eri n'obodo ahụ.
Nke abụọ: Iwepụta mmiri nwa (Mani): n'ihi isusu ọnụ, ma ọ bụ imetụ aka, ma ọ bụ iwepụta ya n'onwe onye (Istimna'), ma ọ bụ ilegide anya ugboro ugboro, ọ dịịrị ya ịkwụghachi ya (Qadaa) naanị n'enweghị Kaffarah; n'ihi na Kaffarah bụ naanị maka inwe mmekọahụ.
Maka onye na-ehi ụra, ọ bụrụ na ọ rọọ nrọ mmekọahụ wee wepụta mmiri; ọ dịghị mmehie ọ bụla dịịrị ya; n'ihi na nke a emeghị site na nhọrọ ya, ya mere ọ ga-asa ahụ nsọ (Ghusl) maka adịghị ọcha (Janabah).
Nke atọ: Iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ n'ama ụma:
N'ihi okwu Onye Dị Elu:
""Rienụ, ṅụọkwanụ ruo mgbe eriri ọcha nke chi ọbụbọ ga-edo unu anya pụọ n'eriri ojii, e mesịa, mezuonụ ibu ọnụ ruo n'abalị...""
[Surah Albakara: 163].
Ma onye ọ bụla riri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ na nchefu; ọ dịghị ihe dịrị ya;
Maka Hadith:
«Onye ọ bụla chefuru mgbe ọ na-ebu ọnụ, wee rie ma ọ bụ ṅụọ ihe, ya mezuo ibu ọnụ ya, n'ihi na n'ezie ọ bụ Chineke nyere ya nri ma nye ya ihe ọṅụṅụ.» [51].
[10] Al-Bukhari dekọtara ya n'ọnụọgụgụ (142), na Muslim n'ọnụọgụgụ (122).
Nke anọ: Ịgbọ agbọ n'ama ụma, mana onye agbọ siri ike gbọọ na-abụghị n'ọchịchọ ya; ọ naghị emetụta ibu ọnụ ya,
Maka okwu ya (udo na ngọzi Chineke dịrị ya)ﷺ sị:
«Onye ọ bụla gbọrọ agbọ n'abụghị uche ya, ọ dịghị nkwụghachi dịịrị ya, ma onye ọ bụla kpachaara anya gbọọ agbọ, ya kwụghachi ya.» [52].
[52] Abu Dawud dekọtara ya n'ọnụọgụgụ (2380), na At-Tirmidhi n'ọnụọgụgụ (719), na Ibn Majah n'ọnụọgụgụ (676).
Nke Ise: Iwepụta ọbara n'ahụ; site n'igbu ọkịkà (Hijama), ma ọ bụ ịgbapụta ọbara (Fasd), ma ọ bụ ịmịpụta ọbara iji nye ya dị ka onyinye iji nyere onye ọrịa aka; ya mere ọ na-emebi ibu ọnụ ya site na ihe ndị a niile.
Maka iwepụta ntakịrị ọbara nke a na-ewepụta maka nyocha; nke a anaghị emetụta ibu ọnụ,
Nakwa, ọbara isite n'ahụ pụta na-abụghị n'ọchịchọ ya; dịka ọbara imi, ma ọ bụ ọnyá, ma ọ bụ ịdọpụ eze; nke a anaghị emetụta ibu ọnụ.